1Nʼoge ahụ kwa, Amrafel, eze Shaịna, na Ariok, eze ndị Elasa, na Kedoloma eze Elam, na Tidal eze Goiim,
2buru agha megide Bera eze Sọdọm, na Biasha eze Gọmọra, na Shịnab, eze Adma, na Shemeba eze Zeboiim, na eze obodo Bela (ya bụ Zoa).
3Ndị eze obodo ndị a: Sọdọm, Gọmọra, Adma, Zeboiim na Bela, jikọtara ndị agha ha ọnụ na Ndagwurugwu Sidim (ya bụ, ndagwurugwu osimiri nnu ahụ).
4Ha fere ofufe nʼokpuru ọchịchị eze Kedoloma afọ iri na abụọ, ma nʼafọ nke iri na atọ, ha nupuru isi.