2buru agha megide Bera eze Sọdọm, na Biasha eze Gọmọra, na Shịnab, eze Adma, na Shemeba eze Zeboiim, na eze obodo Bela (ya bụ Zoa).
3Ndị eze obodo ndị a: Sọdọm, Gọmọra, Adma, Zeboiim na Bela, jikọtara ndị agha ha ọnụ na Ndagwurugwu Sidim (ya bụ, ndagwurugwu osimiri nnu ahụ).
4Ha fere ofufe nʼokpuru ọchịchị eze Kedoloma afọ iri na abụọ, ma nʼafọ nke iri na atọ, ha nupuru isi.
5Nʼafọ nke iri na anọ, eze Kedoloma na ndị eze ya na ha jikọrọ ọnụ buru agha megide ma merie ndị Refaim bi nʼAshterọt Kenaim na ndị Zuzim bi na Ham na ndị Emim bi Kiriatem na Shave,
6na ndị Hor nʼobodo ugwu Sia, ruo obodo El Paran, nke dị nʼakụkụ ọzara.