22Ma Ebram zara eze Sọdọm sị, “Eweliri m aka m elu ṅụọ iyi nye Onyenwe anyị Chineke nke kachasị ihe niile elu, Onye kere eluigwe na ụwa, sị
23na agaghị m esi nʼaka gị were ihe ọbụla bụ nke gị, ọ bụladị eriri maọbụ eriri akpụkpọụkwụ. Ka ị ghara ị sị, ‘Ọ bụ m mere ka Ebram baa ọgaranya.’
24Naanị ihe m ga-anara bụ ihe ụmụ okorobịa m ndị a riri, ya na oke ruuru Anea, na Eshkọl, na Mamre so m gaa. Nye ha oke ruuru ha.”