1Mgbe nke a gasịrị, okwu Onyenwe anyị ruru Ebram site nʼọhụ, sị ya, “Atụla egwu, Ebram Abụ m ọta gị, ụgwọ ọrụ dị ukwu nke i nwere.”
2Ma Ebram zara sị ya, “Gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, gịnị bụ ihe ị ga-enye m ebe ọ bụ na m amụtaghị nwa? Lee, ọ bụ Elieza, onye Damaskọs, ga-eketa akụ m niile.”
3Ebram gara nʼihu kwuo sị, “Ebe ọ bụ na m amụtaghị ụmụ, ọ bụ ohu nọ nʼụlọ m ga-eketa akụ m.”