1Mgbe nke a gasịrị, okwu Onyenwe anyị ruru Ebram site nʼọhụ, sị ya, “Atụla egwu, Ebram Abụ m ọta gị, ụgwọ ọrụ dị ukwu nke i nwere.”
2Ma Ebram zara sị ya, “Gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị, gịnị bụ ihe ị ga-enye m ebe ọ bụ na m amụtaghị nwa? Lee, ọ bụ Elieza, onye Damaskọs, ga-eketa akụ m niile.”
3Ebram gara nʼihu kwuo sị, “Ebe ọ bụ na m amụtaghị ụmụ, ọ bụ ohu nọ nʼụlọ m ga-eketa akụ m.”
4Ma okwu Onyenwe anyị rutere ya, “Nwoke a agaghị eketa ihe i nwere, kama nwa nwoke nke ga-esi nʼahụ gị pụta ga-eketa ihe i nwere.”
5Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kpọpụtara Ebram nʼezi sị ya, “Lelie anya gị elu na mbara eluigwe, gụọ kpakpando niile ị hụrụ ọnụ, ma ị ga-enwe ike ịgụta ha.” Ọ gwara ya sị, “Otu a ka mkpụrụ gị ga-adị. A gaghị agụta ha ọnụ.”