20Ngọzị dịkwara Chineke nke kachasị ihe niile elu, onye weere ndị iro gị nyefee gị nʼaka.” Mgbe ahụ, Ebram nyere ya otu ụzọ nʼime ụzọ iri nke ihe niile.
21Eze Sọdọm gwara Ebram sị, “Nyeghachi m naanị ndị mmadụ, ma debere onwe gị ihe ndị ọzọ.”
22Ma Ebram zara eze Sọdọm sị, “Eweliri m aka m elu ṅụọ iyi nye Onyenwe anyị Chineke nke kachasị ihe niile elu, Onye kere eluigwe na ụwa, sị
23na agaghị m esi nʼaka gị were ihe ọbụla bụ nke gị, ọ bụladị eriri maọbụ eriri akpụkpọụkwụ. Ka ị ghara ị sị, ‘Ọ bụ m mere ka Ebram baa ọgaranya.’
24Naanị ihe m ga-anara bụ ihe ụmụ okorobịa m ndị a riri, ya na oke ruuru Anea, na Eshkọl, na Mamre so m gaa. Nye ha oke ruuru ha.”