5Mgbe ahụ, Serai gwara Ebram sị, “Ọ bụ gị butere ahụhụ a m nọ nʼime ya. Ọ bụ m were nwaodibo nwanyị m kunye gị nʼaka, ma ugbu a ọ hụrụ na ọ dị ime, abụrụla m onye ọ na-eleda anya. Ka Onyenwe anyị kpee ikpe a nʼetiti mụ na gị.”
6Ebram zara Serai sị, “Lee, ohu gị nwanyị dị gị nʼaka. Jiri ya mee ihe ọbụla dị gị mma nʼanya.” Nʼihi nke a, Serai mesiri ya ihe ike, nke mere ka o si nʼebe Serai nọ gbapụ.
7Ma mmụọ ozi Onyenwe anyị hụrụ ya nʼakụkụ isi iyi mmiri dị nʼọzara, nʼakụkụ ụzọ Shua,
8jụọ ya sị, “Hega, ohu nwanyị Serai, olee ebe i si bịa, olee ebe ka ị na-ejekwa?” Hega zara sị, “Ọ bụ site nʼihu nne m ukwu Serai ka m na-agba ọsọ.”
9Mmụọ ozi Onyenwe anyị gwara ya sị, “Laghachikwuru nne gị ukwu. Doo onwe gị nʼokpuru ya.”