3Ya mere Serai nwunye Ebram, duuru Hega, odibo nwanyị ya, onye Ijipt, dunye Ebram ka ọ bụrụ nwunye ya. Ihe a mere na ngwụcha afọ iri site na mgbe Ebram bịara biri nʼala Kenan.
4Ebram na Hega dinara. Hega tụụrụ ime. Ma mgbe Hega matara na ọ dịrịla ime, ọ malitere ileda nne ya ukwu bụ Serai anya.
5Mgbe ahụ, Serai gwara Ebram sị, “Ọ bụ gị butere ahụhụ a m nọ nʼime ya. Ọ bụ m were nwaodibo nwanyị m kunye gị nʼaka, ma ugbu a ọ hụrụ na ọ dị ime, abụrụla m onye ọ na-eleda anya. Ka Onyenwe anyị kpee ikpe a nʼetiti mụ na gị.”
6Ebram zara Serai sị, “Lee, ohu gị nwanyị dị gị nʼaka. Jiri ya mee ihe ọbụla dị gị mma nʼanya.” Nʼihi nke a, Serai mesiri ya ihe ike, nke mere ka o si nʼebe Serai nọ gbapụ.
7Ma mmụọ ozi Onyenwe anyị hụrụ ya nʼakụkụ isi iyi mmiri dị nʼọzara, nʼakụkụ ụzọ Shua,