1Ma Serai nwunye Ebram, amụtaghị nwa. Serai nwere odibo nwanyị onye Ijipt, aha ya bụ Hega.
2Ya mere ọ gwara Ebram sị, “Lee, ugbu a, Onyenwe anyị egbochiela m ịmụta ụmụ. Ugbu a, bakwuru nwanyị na-ejere m ozi. Ma eleghị anya, aga m esi na ya wulite ezinaụlọ m.” Ebram kweere ihe Serai kwuru.
3Ya mere Serai nwunye Ebram, duuru Hega, odibo nwanyị ya, onye Ijipt, dunye Ebram ka ọ bụrụ nwunye ya. Ihe a mere na ngwụcha afọ iri site na mgbe Ebram bịara biri nʼala Kenan.
4Ebram na Hega dinara. Hega tụụrụ ime. Ma mgbe Hega matara na ọ dịrịla ime, ọ malitere ileda nne ya ukwu bụ Serai anya.
5Mgbe ahụ, Serai gwara Ebram sị, “Ọ bụ gị butere ahụhụ a m nọ nʼime ya. Ọ bụ m were nwaodibo nwanyị m kunye gị nʼaka, ma ugbu a ọ hụrụ na ọ dị ime, abụrụla m onye ọ na-eleda anya. Ka Onyenwe anyị kpee ikpe a nʼetiti mụ na gị.”