18Ebraham gwara Chineke sị, “A sịkwa na ị ga-ekwe mee ka Ishmel bụrụ onye dị ndụ nʼihu gị.”
19Ma Chineke zara sị ya, “Ee, kama Sera nwunye gị ga-amụtara gị nwa nwoke. Ị ga-agụ ya Aịzik. Ọgbụgba ndụ m ga-adịkwara ya na agbụrụ ya ruo mgbe ebighị ebi.
20Ma banyere Ishmel, anụla m ihe i kwuru. Aga m agọzi ya mee ya ka ọ baa ụba ma dịkwa ukwuu nʼọnụọgụgụ. Ọ ga-aghọ nna ndị eze iri na abụọ. Aga m eme ya ka ọ ghọọ mba dị ukwuu.
21Ma ọgbụgba ndụ m ka m ga-eme ka o guzosie ike nʼebe Aịzik nọ, onye Sera ga-amụtara gị nʼoge dịka ugbu a nʼafọ ọzọ.”
22Mgbe ọ gwasịrị Ebraham okwu, Chineke si nʼebe ọ nọ pụọ.