23Ebraham jeruru Onyenwe anyị nso jụọ ya sị, “Uche gị ọ bụ ikpochapụ ndị ezi omume na ndị ajọ omume?
24Ọ bụrụ na ị chọta iri ndị ezi omume ise nʼime obodo ahụ, ị ga-ekpochapụ obodo ahụ? Ị gaghị agbaghara ya nʼihi iri ndị ezi omume ise nọ nʼime ya?
25Ọ bụghị ezi ihe na ị ga-ala ndị ezi omume na ndị ajọ omume nʼiyi. Nʼihi na ị gaghị emeso ndị ezi omume dịka i si mesoo ndị na-eme ajọ ihe. O kwesighị ka onye ga-ekpe ụwa niile ikpe, kpee ikpe ziri ezi?”
26Mgbe ahụ, Onyenwe anyị zara sị ya, “Ọ bụrụ na m achọta iri ndị ezi omume ise nʼobodo Sọdọm, aga m agbaghara obodo ahụ niile nʼihi ha.”
27Ebraham kwukwara ọzọ sị, “Ugbu a m nwere ike kwuwapụta okwu nʼihu Onyenwe anyị, mụ onye bụ naanị aja na ntụ.