Jenesis 18

Ebraham kwukwara ọzọ sị, “Ugbu a m nwere ike kwuwapụta okwu nʼihu Onyenwe anyị, mụ onye bụ naanị aja na ntụ.

Genesis 18:27 (UKJV) And Abraham answered and said, Behold now, I have taken upon me to speak unto the LORD, which am but dust and ashes:

25Ọ bụghị ezi ihe na ị ga-ala ndị ezi omume na ndị ajọ omume nʼiyi. Nʼihi na ị gaghị emeso ndị ezi omume dịka i si mesoo ndị na-eme ajọ ihe. O kwesighị ka onye ga-ekpe ụwa niile ikpe, kpee ikpe ziri ezi?”

26Mgbe ahụ, Onyenwe anyị zara sị ya, “Ọ bụrụ na m achọta iri ndị ezi omume ise nʼobodo Sọdọm, aga m agbaghara obodo ahụ niile nʼihi ha.”

27Ebraham kwukwara ọzọ sị, “Ugbu a m nwere ike kwuwapụta okwu nʼihu Onyenwe anyị, mụ onye bụ naanị aja na ntụ.

28Eleghị anya ọ bụrụ na e nweta naanị iri ndị ezi omume anọ na ise, ị ga-emebi obodo ahụ?” Onyenwe anyị zara sị, “Agaghị m ebibi ya ma ọ bụrụ na m achọta iri mmadụ anọ na ise nʼime ya.”

29Ọzọkwa, ọ sịrị ya, “Ọ bụrụkwanụ na a ga-achọta naanị iri mmadụ anọ?” Onyenwe anyị zara sị ya, “Nʼihi iri mmadụ anọ, agaghị m ebibi ya.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.