Jenesis 18

Eleghị anya ọ bụrụ na e nweta naanị iri ndị ezi omume anọ na ise, ị ga-emebi obodo ahụ?” Onyenwe anyị zara sị, “Agaghị m ebibi ya ma ọ bụrụ na m achọta iri mmadụ anọ na ise nʼime ya.”

Genesis 18:28 (UKJV) Possibly there shall lack five of the fifty righteous: will you destroy all the city for lack of five? And he said, If I find there forty and five, I will not destroy it.

26Mgbe ahụ, Onyenwe anyị zara sị ya, “Ọ bụrụ na m achọta iri ndị ezi omume ise nʼobodo Sọdọm, aga m agbaghara obodo ahụ niile nʼihi ha.”

27Ebraham kwukwara ọzọ sị, “Ugbu a m nwere ike kwuwapụta okwu nʼihu Onyenwe anyị, mụ onye bụ naanị aja na ntụ.

28Eleghị anya ọ bụrụ na e nweta naanị iri ndị ezi omume anọ na ise, ị ga-emebi obodo ahụ?” Onyenwe anyị zara sị, “Agaghị m ebibi ya ma ọ bụrụ na m achọta iri mmadụ anọ na ise nʼime ya.”

29Ọzọkwa, ọ sịrị ya, “Ọ bụrụkwanụ na a ga-achọta naanị iri mmadụ anọ?” Onyenwe anyị zara sị ya, “Nʼihi iri mmadụ anọ, agaghị m ebibi ya.”

30Mgbe ahụ ọ sịrị, “Biko, ka iwe hapụ iwe Onyenwe anyị ma m kwuo okwu. Eleghị anya, achọta naanị iri mmadụ atọ nʼebe ahụ?” Onyenwe anyị zaghachiri sị ya, “Agaghị m emebi ya, ma ọ bụrụ na m achọta iri mmadụ atọ nʼime ya.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.