Jenesis 20

Abimelek jụrụ Ebraham sị, “Ọ bụ gịnị ka ị hụrụ i jiri mee omume dị otu a?”

Genesis 20:10 (UKJV) And Abimelech said unto Abraham, What saw you, that you have done this thing?

8Ya mere, Abimelek biliri nʼisi ụtụtụ echi ya, kpọọ nzukọ nke ndịisi ozi ya niile, kọọrọ ha ihe mere. Ha tụrụ ụjọ nke ukwuu.

9Emesịa, Abimelek kpọbatara Ebraham sị ya, “Gịnị bụ ihe a i mere anyị? Gịnị bụ ihe ọjọọ m mere i ji butere mụ na alaeze m ihe oke ikpe ọmụma dị otu a? Ihe a i mere m bụ ihe na-ekwesighị ekwesi.”

10Abimelek jụrụ Ebraham sị, “Ọ bụ gịnị ka ị hụrụ i jiri mee omume dị otu a?”

11Ebraham zara ya, “Nʼihi na asịrị m nʼobi m, ‘Nʼezie, ịtụ egwu Chineke adịghị nʼebe a. Ha ga-egbu m nʼihi nwunye m.’

12Ewezugakwa nke a, ọ bụ nwanna m nwanyị, nʼihi na otu nna mụrụ anyị, ma ọ bụghị otu nne, tupu ọ bụrụ nwunye m.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.