Jenesis 20

Ewezugakwa nke a, ọ bụ nwanna m nwanyị, nʼihi na otu nna mụrụ anyị, ma ọ bụghị otu nne, tupu ọ bụrụ nwunye m.

Genesis 20:12 (UKJV) And yet indeed she is my sister; she is the daughter of my father, but not the daughter of my mother; and she became my wife.

10Abimelek jụrụ Ebraham sị, “Ọ bụ gịnị ka ị hụrụ i jiri mee omume dị otu a?”

11Ebraham zara ya, “Nʼihi na asịrị m nʼobi m, ‘Nʼezie, ịtụ egwu Chineke adịghị nʼebe a. Ha ga-egbu m nʼihi nwunye m.’

12Ewezugakwa nke a, ọ bụ nwanna m nwanyị, nʼihi na otu nna mụrụ anyị, ma ọ bụghị otu nne, tupu ọ bụrụ nwunye m.

13Mgbe Chineke sitere nʼezinaụlọ nna m zipụ m ije ebe dị anya, agwara m ya sị, ‘Otu a ka ị ga-esi gosi na ị hụrụ m nʼanya, ebe ọbụla anyị gara, kwuo gbasara m, “Onye a bụ nwanne m.” ’ ”

14Mgbe ahụ, Abimelek dupụtara atụrụ, na ehi, na ndị ohu ndị ikom, na ndị ohu ndị inyom, nye Ebraham. Ọ kpọnyekwara ya Sera nwunye ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.