Jenesis 20

Nʼihi na Onyenwe anyị mechiri akpanwa ndị inyom niile nọ nʼezinaụlọ Abimelek nʼihi Sera nwunye Ebraham.

Genesis 20:18 (UKJV) For the LORD had fast closed up all the wombs of the house of Abimelech, because of Sarah Abraham's wife.

16Mgbe ahụ, ọ sịrị Sera, “Ana m enye nwanne gị puku shekel ọlaọcha, ka ọ bụrụ ihe m ji kwụọ ụgwọ mmeso ọjọọ m mesoro gị. Ejikwa m ya na-egosi na ị bụ onye aka ya dị ọcha.”

17Mgbe ahụ, Ebraham kpọkuru Chineke nʼekpere. Chineke gwọrọ Abimelek na nwunye ya, na ndị inyom ndị ohu ya niile, ka ha nwee ike ịmụta ụmụ ọzọ.

18Nʼihi na Onyenwe anyị mechiri akpanwa ndị inyom niile nọ nʼezinaụlọ Abimelek nʼihi Sera nwunye Ebraham.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.