1Onyenwe anyị jiri amara leta Sera dịka o kwuru na ọ ga-eme. Onyenwe anyị meere Sera ihe o kwere na nkwa.
2Sera tụụrụ ime, mụọra Ebraham nwa nwoke nʼoge o merela agadi. Ọ mụrụ ya nʼoge ahụ a kara aka Chineke kwere ya na nkwa.
3Ebraham gụrụ nwantakịrị ahụ Sera mụụrụ ya aha, kpọọ ya Aịzik.