3Ma Chineke bịakwutere Abimelek na nrọ nʼanyasị, sị ya, “Onye nwụrụ anwụ ka ị bụ, nʼihi nwanyị nke ị kpọọrọ, nwanyị a bụ onye nwere di.”
4Ma Abimelek abịabeghị Sera nso, ya mere o ji sị, “Onyenwe m, ị ga-ebibi mba aka ya dị ọcha?
5Ọ bụ na ya onwe ya agwaghị m sị, ‘ọ bụ nwanne m nwanyị,’ nke nwanyị nʼonwe ya, ekwuokwa sị, ‘Nwanne m nwoke ka ọ bụ?’ E ji m uche dị ọcha na aka dị ọcha mee ihe niile m mere.”
6Chineke zara ya sị, “Amaara m na i ji uche dị ọcha mee ihe i mere. Ọ bụ ya mere m ji gbochie gị imehie megide m. Ọ bụkwa ya mere m ji gbochie gị ịmetụ ya aka.
7Ugbu a, nyeghachi nwoke a nwunye ya. Nʼihi na ọ bụ onye amụma. Ọ ga-ekpere gị ekpere, ka ị ghara ịnwụ. Ma ọ bụrụ na i dughachịghị nwanyị a nye di ya, unu ga-anwụ, gị na ndị gị niile.”