1Ugbu a, Ebraham sitere nʼebe ahụ bilie gaa na mpaghara Negev biri nʼebe dị nʼagbata Kadesh na Shua. Ọ nọrọ nʼobodo Gera nwa oge nta.
2Nʼebe ahụ, Ebraham kwuru maka Sera, nwunye ya, sị “Ọ bụ nwanne m nwanyị.” Abimelek, eze Gera, ziri ozi kpọrọ Sera.
3Ma Chineke bịakwutere Abimelek na nrọ nʼanyasị, sị ya, “Onye nwụrụ anwụ ka ị bụ, nʼihi nwanyị nke ị kpọọrọ, nwanyị a bụ onye nwere di.”
4Ma Abimelek abịabeghị Sera nso, ya mere o ji sị, “Onyenwe m, ị ga-ebibi mba aka ya dị ọcha?
5Ọ bụ na ya onwe ya agwaghị m sị, ‘ọ bụ nwanne m nwanyị,’ nke nwanyị nʼonwe ya, ekwuokwa sị, ‘Nwanne m nwoke ka ọ bụ?’ E ji m uche dị ọcha na aka dị ọcha mee ihe niile m mere.”