10ọ gwara Ebraham okwu sị ya, “Chụpụ ohu nwanyị a na nwa ya. Nʼihi na nwa nwoke ohu nwanyị agaghị eso nwa m nwoke Aịzik keta oke nʼihe nketa.”
11Okwu a wutere Ebraham nke ukwuu nʼihi na ihe banyere nwa ya nwoke Ishmel na-emetụ ya nʼobi.
12Ma Chineke gwara Ebraham sị, “Ekwela ka obi jọọ gị njọ nʼihi nwantakịrị a na ohu gị nwanyị. Gee ntị nʼihe ọbụla Sera gwara gị. Nʼihi na ọ bụ site nʼAịzik ka a ga-akpọ mkpụrụ gị aha.
13Aga m eme ka nwa gị nwoke nke ohu gị mụtara ghọọ mba dị ukwuu, nʼihi na mkpụrụ afọ gị ka ọ bụ.”
14Ebraham biliri nʼisi ụtụtụ echi ya, kwadoo ihe oriri na mmiri ọṅụṅụ nke dị nʼime karama akpụkpọ, bunye ha Hega. O bukwasịrị ha nʼubu Hega, zipụ ya na nwa ya nwoke. Hega si nʼebe ahụ pụọ wagharịa nʼime ọzara Bịasheba.