12Ma Chineke gwara Ebraham sị, “Ekwela ka obi jọọ gị njọ nʼihi nwantakịrị a na ohu gị nwanyị. Gee ntị nʼihe ọbụla Sera gwara gị. Nʼihi na ọ bụ site nʼAịzik ka a ga-akpọ mkpụrụ gị aha.
13Aga m eme ka nwa gị nwoke nke ohu gị mụtara ghọọ mba dị ukwuu, nʼihi na mkpụrụ afọ gị ka ọ bụ.”
14Ebraham biliri nʼisi ụtụtụ echi ya, kwadoo ihe oriri na mmiri ọṅụṅụ nke dị nʼime karama akpụkpọ, bunye ha Hega. O bukwasịrị ha nʼubu Hega, zipụ ya na nwa ya nwoke. Hega si nʼebe ahụ pụọ wagharịa nʼime ọzara Bịasheba.
15Mgbe mmiri dị na karama akpụkpọ ahụ gwụsịrị, o nibere nwantakịrị ahụ nʼokpuru otu osisi ọhịa.
16Hapụ ya gaa nọdụ ala nʼebe dịtụ anya, ihe dịka narị nzọ ụkwụ, nʼihi na o kwuru nʼobi ya sị, “Achọghị m ịhụ nwantakịrị nwoke a anya mgbe ọ na-anwụ.” Mgbe ọ nọdụrụ ebe ahụ, o bidoro ịkwa akwa.