Jenesis 21

Ya mere, e bidoro ịkpọ ebe ahụ Bịasheba, nʼihi na nʼebe ahụ ka mmadụ abụọ a nọ ṅụrịtaara onwe ha iyi.

Genesis 21:31 (UKJV) Wherefore he called that place Beersheba; because there they swore both of them.

29Abimelek jụrụ Ebraham sị ya, “Gịnị ka i ji nne atụrụ asaa ndị a ị họpụtara iche eme?”

30Ebraham zara sị, “Nabata ụmụ atụrụ asaa ndị a dịka ihe akaebe na-egosi na ọ bụ m gwuru olulu mmiri a.”

31Ya mere, e bidoro ịkpọ ebe ahụ Bịasheba, nʼihi na nʼebe ahụ ka mmadụ abụọ a nọ ṅụrịtaara onwe ha iyi.

32Mgbe ha gbachara ndụ nkwekọrịta na Bịasheba, Abimelek na Fikọl onyeisi agha ya laghachiri azụ nʼala ndị Filistia.

33Ebraham kụrụ osisi tamarisk na Bịasheba. Ebe ahụ ka ọ nọ kpọkuo aha Onyenwe anyị, Chineke ebighị ebi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.