27Mgbe ahụ, Ebraham kpụpụtara atụrụ, na ehi, nye Abimelek. Ha abụọ gbara ndụ nkwekọrịta.
28Mgbe Ebraham sitere nʼigwe atụrụ ya wepụta nne atụrụ asaa nupu ha ka ha nọpụ iche,
29Abimelek jụrụ Ebraham sị ya, “Gịnị ka i ji nne atụrụ asaa ndị a ị họpụtara iche eme?”
30Ebraham zara sị, “Nabata ụmụ atụrụ asaa ndị a dịka ihe akaebe na-egosi na ọ bụ m gwuru olulu mmiri a.”
31Ya mere, e bidoro ịkpọ ebe ahụ Bịasheba, nʼihi na nʼebe ahụ ka mmadụ abụọ a nọ ṅụrịtaara onwe ha iyi.