25Mgbe ahụ, Ebraham kọsaara Abimelek ihe banyere olulu mmiri nke ndị na-ejere ya ozi ji anya ike nara ndị na-ejere Ebraham ozi.
26Abimelek zara sị, “Amaghị m onye mere ihe dị otu a. Ị gwaghị m na ihe dị otu a mere, anụghị m ya ma ọ bụghị naanị taa.”
27Mgbe ahụ, Ebraham kpụpụtara atụrụ, na ehi, nye Abimelek. Ha abụọ gbara ndụ nkwekọrịta.
28Mgbe Ebraham sitere nʼigwe atụrụ ya wepụta nne atụrụ asaa nupu ha ka ha nọpụ iche,
29Abimelek jụrụ Ebraham sị ya, “Gịnị ka i ji nne atụrụ asaa ndị a ị họpụtara iche eme?”