23Ugbu a, ṅụọra m iyi nʼaha Chineke na ị gaghị aghọgbu m maọbụ ghọgbuo ụmụ m, maọbụ ụmụ ụmụ m. Gosi m nʼobodo a i bi nʼime ya dịka onye ọbịa ụdị obiọma m gosiri gị.”
24Ebraham zara sị ya, “Ọ dị mma, aga m aṅụrụ gị iyi.”
25Mgbe ahụ, Ebraham kọsaara Abimelek ihe banyere olulu mmiri nke ndị na-ejere ya ozi ji anya ike nara ndị na-ejere Ebraham ozi.
26Abimelek zara sị, “Amaghị m onye mere ihe dị otu a. Ị gwaghị m na ihe dị otu a mere, anụghị m ya ma ọ bụghị naanị taa.”
27Mgbe ahụ, Ebraham kpụpụtara atụrụ, na ehi, nye Abimelek. Ha abụọ gbara ndụ nkwekọrịta.