Jenesis 23

ghọrọ nke Ebraham dịka ihe nzụta ya nʼihu ụmụ Het, nʼihu ndị niile ndị bịara nʼọnụ ụzọ e si abata obodo ahụ.

Genesis 23:18 (UKJV) Unto Abraham for a possession in the presence of the children of Heth, before all that went in at the gate of his city.

16Ebraham kwenyere nʼego ole Efrọn chọrọ ka ọ kwụọ. O ji ihe ọtụtụ tụpụtara Efrọn ego ruru ọnụahịa ọ kpọrọ aha nʼihu ndị Het niile, narị shekel ọlaọcha anọ, dịka ihe ọtụtụ nke dị nʼoge ahụ nʼetiti ndị na-azụ ahịa.

17Site nʼoge ahụ, ala ahụ Efrọn nwere na Makipela, nke dị nso na Mamre, ala ahụ na ọgba dị nʼime ya, na osisi niile dị nʼime ala ahụ niile gburugburu,

18ghọrọ nke Ebraham dịka ihe nzụta ya nʼihu ụmụ Het, nʼihu ndị niile ndị bịara nʼọnụ ụzọ e si abata obodo ahụ.

19Emesịa, Ebraham liri Sera nwunye ya nʼime ọgba ahụ dị nʼala dị na Makipela na nso Mamre (nke dị na Hebrọn) nʼala ndị Kenan.

20Ya mere, ala ahụ na ọgba dị nʼime ya ka ndị Het resiri Ebraham ka ọ bụrụ nke ya, ebe a na-eli ozu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.