Jenesis 23

Site nʼoge ahụ, ala ahụ Efrọn nwere na Makipela, nke dị nso na Mamre, ala ahụ na ọgba dị nʼime ya, na osisi niile dị nʼime ala ahụ niile gburugburu,

Genesis 23:17 (UKJV) And the field of Ephron which was in Machpelah, which was before Mamre, the field, and the cave which was therein, and all the trees that were in the field, that were in all the borders round about, were made sure

15“Gee m ntị, nna m ukwu, ọ bụ ezie na ala ahụ ruru narị shekel ọlaọcha anọ, ma gịnị ka nke a bụ nʼetiti mụ na gị? Gaa lie onye gị nwụrụ anwụ nʼime ya.”

16Ebraham kwenyere nʼego ole Efrọn chọrọ ka ọ kwụọ. O ji ihe ọtụtụ tụpụtara Efrọn ego ruru ọnụahịa ọ kpọrọ aha nʼihu ndị Het niile, narị shekel ọlaọcha anọ, dịka ihe ọtụtụ nke dị nʼoge ahụ nʼetiti ndị na-azụ ahịa.

17Site nʼoge ahụ, ala ahụ Efrọn nwere na Makipela, nke dị nso na Mamre, ala ahụ na ọgba dị nʼime ya, na osisi niile dị nʼime ala ahụ niile gburugburu,

18ghọrọ nke Ebraham dịka ihe nzụta ya nʼihu ụmụ Het, nʼihu ndị niile ndị bịara nʼọnụ ụzọ e si abata obodo ahụ.

19Emesịa, Ebraham liri Sera nwunye ya nʼime ọgba ahụ dị nʼala dị na Makipela na nso Mamre (nke dị na Hebrọn) nʼala ndị Kenan.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.