Jenesis 24

Ọ jụrụ ya sị, “Nwa onye ka ị bụ? Ohere ọ dị nʼụlọ nna gị ebe mụ na ịnyịnya kamel ndị a ga-anọ nʼabalị a?”

Genesis 24:23 (UKJV) And said, Whose daughter are you? tell me, I pray you: is there room in your father's house for us to lodge in?

21Mgbe ihe ndị a na-eme, ohu ahụ gbara nkịtị na-ele ya anya ịchọpụta ma Onyenwe anyị emeela ka ije ya bụrụ ihe gara nke ọma.

22Mgbe ịnyịnya kamel ndị ahụ ṅụsịrị mmiri, nwoke ahụ wepụtara mgbanimi ọlaedo nke ọtụtụ ya bụ otu beka, na mgbaaka ọlaedo abụọ nke ọtụtụ ha bụ shekel iri.

23Ọ jụrụ ya sị, “Nwa onye ka ị bụ? Ohere ọ dị nʼụlọ nna gị ebe mụ na ịnyịnya kamel ndị a ga-anọ nʼabalị a?”

24Ọ zara sị ya, “Abụ m nwa Betuel, nwa Milka nwunye Nahọ.”

25Ọ sịkwara, “Anyị nwere nri anụ ụlọ, nweekwa ebe ị ga-edina nʼabalị a.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.