23Ọ jụrụ ya sị, “Nwa onye ka ị bụ? Ohere ọ dị nʼụlọ nna gị ebe mụ na ịnyịnya kamel ndị a ga-anọ nʼabalị a?”
24Ọ zara sị ya, “Abụ m nwa Betuel, nwa Milka nwunye Nahọ.”
25Ọ sịkwara, “Anyị nwere nri anụ ụlọ, nweekwa ebe ị ga-edina nʼabalị a.”
26Nwoke ahụ hulatara ala kpọọ isiala nye Onyenwe anyị.
27Kwuo sị, “Ngọzị dịrị Onyenwe anyị, bụ Chineke nna m ukwu Ebraham, onye na-esitebeghị nʼebe nna m ukwu nọ wezuga ebere ya na ikwesi ntụkwasị obi ya. Ma banyere mụ onwe m, Onyenwe anyị e duola m nʼije a, kpọrọ m rute nʼụlọ ndị ikwu nna m ukwu.”