30Mgbe ọ hụrụ mgbanimi, na mgbaaka ndị ahụ nwanne ya nwanyị yi nʼaka ya, ma nụkwa ihe Ribeka kwuru banyere ihe nwoke ahụ gwara ya, o jekwuru nwoke ahụ, hụ ya ka ya na ịnyịnya kamel ya guzo nʼakụkụ olulu mmiri.
31Ọ sịrị ya, “Bịa, gị onye Onyenwe anyị gọziri. Gịnị mere i ji guzo nʼebe a. Edozielara m gị ụlọ ebe ị ga-edina na ebe ịnyịnya kamel ndị a ga-anọ.”
32Ya mere, nwoke ahụ gara nʼụlọ, ebe Leban nyere aka butukwaara ya ibu nke ịnyịnya kamel ndị ahụ bu. E wetara nri nye ịnyịnya kamel ndị ahụ, wetara ya mmiri nke ya na ndị ikom so ya ji saa ụkwụ ha.
33E doziri ya ihe oriri, ma ọ zara sị, “Agaghị m eri ihe ọbụla tutu ruo mgbe m kwuru ihe m ji bịa.” Leban sịrị, “Ngwa, kwuonụ.”
34Ya mere, ọ sịrị, “Abụ m ohu Ebraham.