33E doziri ya ihe oriri, ma ọ zara sị, “Agaghị m eri ihe ọbụla tutu ruo mgbe m kwuru ihe m ji bịa.” Leban sịrị, “Ngwa, kwuonụ.”
34Ya mere, ọ sịrị, “Abụ m ohu Ebraham.
35Onyenwe anyị agọziela nna m ukwu, mee ya ka ọ bụrụ ọgaranya. O nyela ya igwe atụrụ, na igwe ehi, na ọlaọcha na ọlaedo, na ọtụtụ ndị ohu nwoke na nwanyị, na ịnyịnya kamel, na ịnyịnya ibu.
36Sera nwunye nna m ukwu mụtaara ya otu nwa nwoke mgbe o merela agadi. Ihe niile nna m ukwu nwere ka o nyefere nwa ahụ nʼaka.
37Nna m ukwu mere ka m ṅụọra ya iyi sị, ‘Ị gaghị esite nʼetiti ụmụ ndị inyom Kenan ndị anyị bi nʼala ha lụtara nwa m nwoke nwunye.