35Onyenwe anyị agọziela nna m ukwu, mee ya ka ọ bụrụ ọgaranya. O nyela ya igwe atụrụ, na igwe ehi, na ọlaọcha na ọlaedo, na ọtụtụ ndị ohu nwoke na nwanyị, na ịnyịnya kamel, na ịnyịnya ibu.
36Sera nwunye nna m ukwu mụtaara ya otu nwa nwoke mgbe o merela agadi. Ihe niile nna m ukwu nwere ka o nyefere nwa ahụ nʼaka.
37Nna m ukwu mere ka m ṅụọra ya iyi sị, ‘Ị gaghị esite nʼetiti ụmụ ndị inyom Kenan ndị anyị bi nʼala ha lụtara nwa m nwoke nwunye.
38Kama ị ga-aga nʼezinaụlọ nna m, na nke ndị ikwu m chọtara nwa m nwoke nwunye.’
39“Mgbe ahụ, ajụrụ m nna m ukwu, ‘Ọ bụrụkwanụ na nwanyị ahụ ekweghị iso m lọghachi?’