39“Mgbe ahụ, ajụrụ m nna m ukwu, ‘Ọ bụrụkwanụ na nwanyị ahụ ekweghị iso m lọghachi?’
40“Ọ sịrị, ‘Onyenwe anyị, onye m na-ejegharị nʼihu ya, ga-eziga mmụọ ozi ya ka o soro gị gaa ime ka ije gị nwee isi, ka i nwee ike chọtara nwa m nwoke nwanyị site nʼetiti ndị ikwu m na ezinaụlọ nna m.
41Ị ga-abụ onye nwere onwe gị site nʼiyi ị ṅụrụ ma ọ bụrụ na mgbe i gakwuru ndị ikwu m, ha jụrụ ịkpọnye gị nwanyị ahụ. Ị ga-abụ onye nwere onwe gị site nʼiyi ị ṅụrụ m.’
42“Mgbe m rutere nʼisi iyi mmiri taa, ekwuru m sị, ‘Onyenwe anyị Chineke nna m ukwu Ebraham, ọ bụrụ na ọ masị gị, biko mee ka ije a m bịara bụrụ nke ga-aga nke ọma.
43Lee, ka m na-eguzo nʼakụkụ isi iyi mmiri a, ka nwaagbọghọ ahụ bịara ikuru mmiri nke m ga-asị, “Biko kwere ka m si nʼite gị ṅụrụtụ ntakịrị mmiri,”