47“Mgbe ahụ, ajụrụ m ya, ‘Nwa onye ka ị bụ?’ “Ọ sịrị m, ‘Abụ m nwa Betuel onye bụ nwa Nahọ nke Milka mụtaara ya.’ “Mgbe ahụ etinyere m ya mgbanimi ahụ nʼimi ya, tinyekwa ọlaaka ahụ nʼaka ya abụọ.
48Ehulatara m ala kpọọ isiala nye Onyenwe anyị. Etoro m Onyenwe anyị, Chineke nke nna m ukwu Ebraham, onye duru m nʼezi ụzọ inweta nwa nwanne nna m ukwu dịka nwunye nwa ya nwoke.
49Ugbu a, ọ bụrụ na unu ga-egosi nna m ukwu obiọma na ikwesi ntụkwasị obi gwanụ m. Ọ bụrụkwanụ na ọ gaghị esi otu a dịrị, gwanụ m ka m mata ụzọ m ga-agbaso.”
50Leban na Betuel zara sị ya, “Ihe niile si nʼaka Onyenwe anyị. Anyị enweghị ike ịgwa gị okwu ọjọọ maọbụ nke ọma.
51Lee Ribeka, kpọrọ ya laa, ka ọ bụrụ nwunye nwa nna gị ukwu, dịka Onyenwe anyị kwuru.”