Jenesis 24

Ribeka nʼonwe ya lepụkwara anya hụ Aịzik. O sitere nʼelu ịnyịnya kamel rịdata,

Genesis 24:64 (UKJV) And Rebekah lifted up her eyes, and when she saw Isaac, she lighted off the camel.

62Nʼoge a, Aịzik bịara nʼebe mbata obodo Bịa-Lahai-Rọị nʼihi na o bi na Negev.

63Aịzik pụtara ịtụgharị uche nʼọhịa nʼoge uhuruchi. Ọ lepụrụ anya hụ ọtụtụ ịnyịnya kamel na-abịanụ.

64Ribeka nʼonwe ya lepụkwara anya hụ Aịzik. O sitere nʼelu ịnyịnya kamel rịdata,

65jụọ ohu ahụ sị, “Onye bụ nwoke a si nʼọhịa na-abịa izute anyị?” Ohu ahụ zara sị ya, “Ọ bụ nna m ukwu” Nʼihi nke a, Ribeka weere akwa mkpudo ya kpuchie ihu ya.

66Ohu ahụ kọọrọ Aịzik akụkọ otu ije ya niile si gaa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.