64Ribeka nʼonwe ya lepụkwara anya hụ Aịzik. O sitere nʼelu ịnyịnya kamel rịdata,
65jụọ ohu ahụ sị, “Onye bụ nwoke a si nʼọhịa na-abịa izute anyị?” Ohu ahụ zara sị ya, “Ọ bụ nna m ukwu” Nʼihi nke a, Ribeka weere akwa mkpudo ya kpuchie ihu ya.
66Ohu ahụ kọọrọ Aịzik akụkọ otu ije ya niile si gaa.
67Aịzik kpọbatara Ribeka nʼụlọ ikwu Sera, nne ya. Ọ lụrụ Ribeka, onye ghọrọ nwunye ya. Aịzik hụrụ ya nʼanya, ma nweta nkasiobi nʼihi ọnwụ nne ya.