8Ebraham kubiri ume ndụ nwụọ mgbe o mere nnọọ ezigbo agadi, agadi nwoke nke ndụ juru afọ, e mere ka ọ lakwuru ndị ya.
9Ụmụ ya, Aịzik na Ishmel, liri ya nʼọgba Makipela nʼakụkụ Mamre, nʼala ubi Efrọn nwa Zoha onye Het,
10ala ahụ Ebraham zụrụ site nʼaka ndị Het. Ebe ahụ ka e liri Ebraham ya na Sera nwunye ya.
11Mgbe Ebraham nwụrụ, Chineke gọziri nwa ya nwoke Aịzik onye bi nʼoge ahụ na nso nso Bịa-Lahai-Rọị.
12Nke a bụ akụkọ banyere usoro ezinaụlọ Ishmel nwa Ebraham onye Hega, nwanyị Ijipt ahụ na-ejere Sera ozi mụụrụ ya.