Jenesis 25

Mgbe Ebraham nwụrụ, Chineke gọziri nwa ya nwoke Aịzik onye bi nʼoge ahụ na nso nso Bịa-Lahai-Rọị.

Genesis 25:11 (UKJV) And it came to pass after the death of Abraham, that God blessed his son Isaac; and Isaac dwelt by the well Lahairoi.

9Ụmụ ya, Aịzik na Ishmel, liri ya nʼọgba Makipela nʼakụkụ Mamre, nʼala ubi Efrọn nwa Zoha onye Het,

10ala ahụ Ebraham zụrụ site nʼaka ndị Het. Ebe ahụ ka e liri Ebraham ya na Sera nwunye ya.

11Mgbe Ebraham nwụrụ, Chineke gọziri nwa ya nwoke Aịzik onye bi nʼoge ahụ na nso nso Bịa-Lahai-Rọị.

12Nke a bụ akụkọ banyere usoro ezinaụlọ Ishmel nwa Ebraham onye Hega, nwanyị Ijipt ahụ na-ejere Sera ozi mụụrụ ya.

13Ndị a bụ aha ụmụ ndị ikom Ishmel nʼusoro ọmụmụ ha. Nebaiot bụ nwa mbụ ya. Ndị ọzọ bụ Keda, Adbel, Mibsam,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.