Jenesis 25

Mgbe oge ime ya zuru, ụmụ abụọ dị nʼakpanwa ya.

Genesis 25:24 (UKJV) And when her days to be delivered were fulfilled, behold, there were twins in her womb.

22Ụmụ o bu nʼafọ bidoro na-alụ ọgụ nʼime afọ ya. Nʼihi nke a, o kwuru sị, “Gịnị mere ihe dị otu a ji eme m?” Ya mere, ọ gara jụta ase nʼaka Onyenwe anyị.

23Onyenwe anyị gwara ya sị, “Mba abụọ dị gị nʼafọ, ụzọ mba abụọ dị nʼime gị ka a ga-ekewa. Otu ụzọ ga-adị ike karịa nke ọzọ, nke okenye ga-ejere nke nta ozi.”

24Mgbe oge ime ya zuru, ụmụ abụọ dị nʼakpanwa ya.

25Ahụ nwa nke mbụ buru ụzọ pụta na-acha uhie uhie, ahụ ya niile dịka uwe ajị. Nʼihi ya, ha kpọrọ aha ya Ịsọ.

26Emesịa, nwanne ya pụtara, ma aka ya jidere ikiri ụkwụ Ịsọ. Nʼihi ya, a kpọrọ aha ya Jekọb. Aịzik gbara iri afọ isii mgbe Ribeka mụrụ ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.