8Mgbe Aịzik nọrọ ebe ahụ ogologo oge, Abimelek eze ndị Filistia, sitere na oghereikuku ya lepụ anya hụ Aịzik ka ọ nọ na-egwusa Ribeka nwunye ya egwu.
9Ya mere, Abimelek kpọrọ Aịzik sị, “Nwunye gị ka ọ bụ nʼezie. Gịnị mere i ji gwa anyị na ọ bụ nwanne gị nwanyị?” Aịzik zara ya, “Ọ bụ nʼihi na m chere na-enwere ike igbu m nʼihi ya.”
10Abimelek sịrị, “Gịnị bụ ihe a i mere anyị? Otu nwoke nʼetiti anyị gaara akpọrọ nwunye gị dinaa ya. Ị gaara esi otu a wetara anyị ikpe ọmụma.”
11Ya mere, Abimelek nyere ndị niile ya iwu, sị ha, “Onye ọbụla metụrụ nwoke a maọbụ nwunye ya aka, aghaghị ime ka ọ nwụọ.”
12Aịzik kụrụ mkpụrụ ubi nʼala ahụ. Nʼotu afọ ahụ kwa, o si nʼala ahụ webata ihe ubi narị okpukpu karịa nke ọ kụrụ, nʼihi na Onyenwe anyị gọziri ya.