20Ma Aịzik jụrụ nwa ya nwoke sị, “Olee otu i si chọta ya ngwangwa, nwa m?” Jekọb zara ya sị, “Ọ bụ Onyenwe anyị Chineke gị mere ka ihe gaara m nke ọma.”
21Mgbe ahụ Aịzik gwara Jekọb sị, “Bịa nso ka m metụ gị aka nwa m nwoke, ka m mata ma ị bụ Ịsọ nʼeziokwu.”
22Jekọb jere nna ya Aịzik nso, onye metụrụ ya aka kwuo sị, “Olu bụ olu Jekọb ma aka gị bụ aka Ịsọ.”
23Ọ chọpụtaghị na ọ bụ Jekọb, nʼihi na aka ya dị ajị ajị dịka nke Ịsọ. Ya mere, ọ gọziri ya.
24Ma ọ jụkwara ya ajụjụ ọzọ sị ya, “Ị bụ nwa m nwoke Ịsọ nʼeziokwu?” Jekọb zara sị ya, “E, abụ m ya.”