22Jekọb jere nna ya Aịzik nso, onye metụrụ ya aka kwuo sị, “Olu bụ olu Jekọb ma aka gị bụ aka Ịsọ.”
23Ọ chọpụtaghị na ọ bụ Jekọb, nʼihi na aka ya dị ajị ajị dịka nke Ịsọ. Ya mere, ọ gọziri ya.
24Ma ọ jụkwara ya ajụjụ ọzọ sị ya, “Ị bụ nwa m nwoke Ịsọ nʼeziokwu?” Jekọb zara sị ya, “E, abụ m ya.”
25Mgbe ahụ, Aịzik zara sị ya, “Butere m ụfọdụ nʼime anụ ahụ i gbutere ka m rie, nye gị ngọzị m.” Jekọb butere ya bunye ya. O riri ya.
26Mgbe ahụ, nna ya Aịzik sịrị ya, “Bịa nʼebe a nwa m nwoke, sutu m ọnụ.”