Jenesis 27

Mgbe ahụ, nna ya Aịzik sịrị ya, “Bịa nʼebe a nwa m nwoke, sutu m ọnụ.”

Genesis 27:26 (UKJV) And his father Isaac said unto him, Come near now, and kiss me, my son.

24Ma ọ jụkwara ya ajụjụ ọzọ sị ya, “Ị bụ nwa m nwoke Ịsọ nʼeziokwu?” Jekọb zara sị ya, “E, abụ m ya.”

25Mgbe ahụ, Aịzik zara sị ya, “Butere m ụfọdụ nʼime anụ ahụ i gbutere ka m rie, nye gị ngọzị m.” Jekọb butere ya bunye ya. O riri ya.

26Mgbe ahụ, nna ya Aịzik sịrị ya, “Bịa nʼebe a nwa m nwoke, sutu m ọnụ.”

27Ya mere, o jekwuuru ya sutu ya ọnụ. Mgbe Aịzik nụrụ isisi uwe ya, ọ gọziri ya, sị, “Nʼezie, isisi nwa m nwoke dịka isisi ala ubi nke Onyenwe anyị gọziri.

28Ka Chineke nye gị site nʼigirigi nke eluigwe, na mmanụ nke ala, ụba nke mkpụrụ ubi na mmanya ọhụrụ

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.