7‘Gaa nʼọhịa gbute anụ, siere m nri ụtọ, ka m nọdụ nʼihu Onyenwe anyị nye gị ngọzị ikpeazụ tupu m nwụọ.’
8Ugbu a, nwa m nwoke, gee ntị nke ọma, mee ihe niile m gwara gị.
9Gaa ugbu a nʼigwe anụ ụlọ wetara m ụmụ nwa ewu abụọ dị mma ka m jiri ha siere nna gị nri dị ụtọ, ụdị ahụ na-amasị ya.
10Ị ga-eburu ya bujere nna gị ka o rie, ka ya onwe ya gọzie gị tupu ọ nwụọ.”
11Ma Jekọb gwara Ribeka nne ya okwu sị ya, “Nwanne m nwoke Ịsọ bụ onye gbara ajị. Ahụ nke m na-akwọ mụrụmụrụ.