9Nʼihi ya, Ịsọ gakwuru Ishmel lụrụ Mahalat, ada Ishmel, nwa Ebraham, onye bụ nwanyị Nebaiot, tinyekwara ndị nwunye ọ lụrụ na mbụ.
10Jekọb hapụrụ Bịasheba gawa Haran.
11Mgbe chi na-eji, ọ kwụsịrị ebe ọ ga-anọ zuo ike abalị. Mgbe ọ chọrọ idina ala, o weere otu nʼime nkume ndị dị nʼebe ahụ hinye nʼisi ya, dinara ala ịrahụ ụra.
12Nʼabalị ahụ, ọ rọrọ nrọ, hụ mbube e ji arị elu. E mere ka o guzo site nʼụwa ruo nʼeluigwe. Ọ hụkwara ndị mmụọ ozi Chineke ka ha si na ya na-arịgo na-arịdakwa.
13Nʼelu ya, ọ hụrụ Onyenwe anyị ka o guzo, nụkwa ka ọ na-agwa ya okwu sị, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, Chineke nna gị Ebraham, na Chineke Aịzik. Aga m enye gị na ụmụ ụmụ gị ala ahụ nke i dina nʼelu ya.