13Mgbe Leban nụrụ maka Jekọb nwa nwanne ya nwanyị, o mere ngwangwa pụọ izute ya. Ọ makụrụ ya, sutu ya ọnụ, kpọrọ ya laa nʼụlọ. Nʼebe ahụ, Jekọb kọọrọ ya ihe ndị a niile.
14Leban sịrị ya, “Nʼezie, ị bụ ọkpụkpụ m na anụ ahụ m.” Ọ nọnyeere ya otu ọnwa.
15Leban sịrị Jekọb, “Ọ bụ nʼihi na ị bụ onye ikwu m ka ị na-agbara m odibo nʼefu? Gwa m ego ole m ga-akwụ gị nʼihi ọrụ ị na-arụrụ m?”
16Leban mụrụ ụmụ ndị inyom abụọ. Aha nke okenye bụ Lịa. Aha nke nta bụ Rechel.
17Ịma mma Lịa dị ya nʼanya, ma Rechel mara mma nʼahụ, maakwa mma ile anya.