15Leban sịrị Jekọb, “Ọ bụ nʼihi na ị bụ onye ikwu m ka ị na-agbara m odibo nʼefu? Gwa m ego ole m ga-akwụ gị nʼihi ọrụ ị na-arụrụ m?”
16Leban mụrụ ụmụ ndị inyom abụọ. Aha nke okenye bụ Lịa. Aha nke nta bụ Rechel.
17Ịma mma Lịa dị ya nʼanya, ma Rechel mara mma nʼahụ, maakwa mma ile anya.
18Ọ bụ Rechel ka Jekọb hụrụ nʼanya. Nʼihi ya Jekọb gwara Leban sị, “Aga m arụrụ gị ọrụ afọ asaa ma ọ bụrụ na ị ga-ekwe ka m lụọ Rechel.”
19Leban zara Jekọb sị ya, “Ọ dị mma na ị lụrụ Rechel karịa na onye ọzọ ga-alụ ya. Soro m nọdụ nʼebe a.”