20Ya mere Jekọb gbara odibo afọ asaa maka Rechel. Ma afọ asaa ndị a dịka abalị ole na ole nʼanya Jekọb nʼihi ịhụnanya o nwere nʼebe Rechel nọ.
21Jekọb gwara Leban, okwu sị ya, “Kpọnye m nwunye m nʼihi nʼụbọchị m ezuola. Achọrọ m ịbakwuru ya.”
22Leban kpọkọtara ndị niile bi nʼebe ahụ mere ha nʼoke oriri.
23Nʼanyasị ụbọchị ahụ, Leban kpọọrọ nwa ya nwanyị bụ Lịa kpọbara Jekọb, ọ bakwuuru ya.
24Leban nyekwara Lịa odibo ya, Zilpa, ka ọ bụrụ odibo nwanyị ya.