23Nʼanyasị ụbọchị ahụ, Leban kpọọrọ nwa ya nwanyị bụ Lịa kpọbara Jekọb, ọ bakwuuru ya.
24Leban nyekwara Lịa odibo ya, Zilpa, ka ọ bụrụ odibo nwanyị ya.
25Mgbe chi bọrọ, Jekọb hụrụ na ọ bụ Lịa ka Leban kpọnyere ya. Jekọb sịrị Leban, “Gịnị bụ ihe a i mere m? Ọ bụghị nʼihi Rechel ka m ji gbaara gị odibo? Gịnị mere i ji ghọgbuo m?”
26Leban zara sị ya, “Ọ bụghị omenaala anyị ibu ụzọ kee nwantakịrị nwanyị nke nta di tupu nke ada.
27Otu ọ dị, chere ka mmemme izu ụka nke onye nke a gafee. Mgbe ahụ, aga m akpọnyekwa gị onye nke ọzọ a maka odibo ị ga-agbara m afọ asaa ọzọ.”