25Mgbe chi bọrọ, Jekọb hụrụ na ọ bụ Lịa ka Leban kpọnyere ya. Jekọb sịrị Leban, “Gịnị bụ ihe a i mere m? Ọ bụghị nʼihi Rechel ka m ji gbaara gị odibo? Gịnị mere i ji ghọgbuo m?”
26Leban zara sị ya, “Ọ bụghị omenaala anyị ibu ụzọ kee nwantakịrị nwanyị nke nta di tupu nke ada.
27Otu ọ dị, chere ka mmemme izu ụka nke onye nke a gafee. Mgbe ahụ, aga m akpọnyekwa gị onye nke ọzọ a maka odibo ị ga-agbara m afọ asaa ọzọ.”
28Jekọb mere ka o si kwuo. O debezuru mmemme otu izu ụka onye nke a, Leban kpọnyere ya nwa ya Rechel ka ọ bụrụ nwunye ya.
29Leban nyere nwa ya nwanyị, Rechel, odibo ya nwanyị bụ Bilha, ka ọ bụrụ odibo ya.